Exodus 25

Onyinye maka owuwu ụlọ nzute

1 Onyenwe anyị gwara Mosis sị, 2“Gwa ụmụ Izrel ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a.

3“Ndị a bụ Onyinye ị ga-anata nʼaka ha:

“ọlaọcha, ọlaedo na bronz.
4Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha,
na nke ajị ewu;
5akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri,
na osisi akashia;
6mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ,
ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ;
7nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd,
Efọọd bụ uwe dị nso nke onyeisi nchụaja na-eyi. Ọpụ 28:4,6-14
na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi.

8“Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha. 9Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị.

Igbe ọgbụgba ndụ

10“Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. 11Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. 12Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya 13Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a. 14Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya. 15Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile. 16Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime ya.

17“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara. 18Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. 19Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ. 20Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. 21Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ. 22Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.

Tebul na achịcha dị nsọ.

23“Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa. 24Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu. 25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka
Ihe dịka inchi atọ
dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu.
26Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya. 27Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ. 28Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha. 29Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye. 30Dọkwasị achịcha nke iche nʼIhu nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile.

Ihe ịdọba oriọna

31“Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. 32Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. 33Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ. 34Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya. 35Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii. 36Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ.

37“Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya. 38Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha. 39Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile. 40Lezie anya hụ na i mere ihe ndị a niile nʼusoro ihe atụ nke e gosiri gị nʼelu ugwu.

Copyright information for IboBIU